Dickin Medal
From Wikipedia, the free encyclopedia
Àtụ:Infobox award Maria Dickin guzobere PDSA Dickin Medal n'afọ 1943 na United Kingdom iji sọpụrụ ọrụ ụmụ anụmanụ na Agha Ụwa nke Abụọ. Ọ bụ ihe nrite ọla nchara, nke nwere okwu "For Gallantry" yana "We Also Serve" n'ime okpueze laurel, nke e buuru n'eriri nwere agba akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, na-acha nchara nchara, nakwa anụnụ anụnụ.[1] A na-enye ya ụmụ anụmanụ ndị gosipụtara "nkà pụrụ iche maọbụ ndị tinyere uchu mgbe ha na-eje ozi maọbụ ndị e jikọtara ya na ngalaba ọ bụla nke ndị agha ma ọ bụ ndị na-ahụ maka nchekwa obodo".[1] A na-akpọkarị onyinye ahụ "Victoria Cross nke ụmụ anụmanụ".[1][2][3]
Oge/afọ mmalite | 1943 |
---|---|
akara ala | Dickin Medal |
A gụrụ aha | Maria Dickin |
mba/obodo | Obodoézè Nà Ofú |
webụsaịtị | https://www.pdsa.org.uk/what-we-do/animal-honours/the-dickin-medal |
Maria Dickin bụ onye guzobere People's Dispensary for Sick Animals (PDSA), ọrụ ebere maka ahụike ụmụ anụmanụ nke Britain. O guzobere ihe nrite ahụ maka anụmanụ ọ bụla na-egosipụta obi ike ma tinye uchu doro anya n'ọrụ mgbe ha na-eje ozi nyere ndị agha nke Alaeze Ukwu Britain ma ọ bụ ndị ọrụ mberede obodo. E nyere ihe nrite ahụ ugboro 54 n'etiti afọ 1943 na 1949 nye nduru 32, nkịta 18, ịnyịnya 3, na nwamba nke ụgbọ mmiri iji nabata omume obi ike ma ọ bụ itinye uchu n'oge Agha Ụwa nke Abụọ na esemokwu ndị ọzọ na-esote.
E weghachiri inye ihe nrite ahụ n'afọ 2000. N'ọnwa Disemba afọ 2007, ndị natara ihe nrite ahụ n'
mbụ ọnụọgụ ha dị 1e liri 2 n'ogige PDSA Animal Cemetery dị na Ilford, Essex,wetara n nsọpụrndị ụ agha zuru oke na ngwụcha ọrụ enyemaka nke National Lottery iji weghachitogege i ili ahụ.[4][5]